YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 1

1
1Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa. 2Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n'elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n'elu miri. 3Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di. 4Chineke we hu ìhè ahu, na ọ di nma: Chineke we kpa ókè n'etiti ìhè ahu na ọchichiri ahu. 5Chineke we kpọ ìhè ahu Ehihie, ọchichiri ahu ka Ọ kpọkwara Abali. Anyasi we di, ututu we di, buru otù ubọchi.
6Chineke we si, Ka mbara di n'ab͕ata miri ahu, ka ọ nọ kwa nākpa ókè n'etiti miri na miri. 7Chineke we me mbara ahu, kpa ókè n'etiti miri ahu nke di n'okpuru mbara ahu na miri ahu nke di n'elu mbara ahu: ọ we di otú a. 8Chineke we kpọ mbara ahu Elu-igwe. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-abua.
9Chineke we si, Miri ahu nke di n'okpuru elu-igwe, ka achikọta ha n'otù ebe, ka ahú kwa ala-akọrọ: ọ we di otú a. 10Chineke we kpọ ala-akọrọ ahu Ala; nchikọta miri ahu ka Ọ kpọkwara Oké Osimiri: Chineke we hu na ọ di nma. 11Chineke we si, Ka ala puputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha, osisi mkpuru nke nāmi mkpuru di iche iche, nke mkpuru-ọghi-gha-ya di nime ya, n'elu ala: o we di otú a. 12Ala we weputa ahihia ndu, ihe-ọkukú nke nāmiputa nkpuru-ọghigha di iche iche, ya na osisi nke nāmi mkpuru di iche iche, nke nkpuru-ọghigha-ya di nime ya: Chineke we hu na ọ di nma. 13Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-atọ.
14Chineke we si, Ka ihe nke nēnye ihè di na mbara elu-igwe ikpa ókè n'etiti ehihie na abali; ka ha buru kwa ihe igosi ihe-iriba-ama di iche iche, na igu mb͕e akara àkà, na igu ubọchi na arọ: 15ka ha buru kwa ihe nēnye ìhè nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa: o we di otú a. 16Chineke we kpua ihe uku abua ahu nke nēnye ìhè; Ọ kpuru ihe ahu nēnye ìhè nke ka uku ka ọ nāchi ehihie, na ihe ahu nēnye ìhè nke ka ntà ka ọ nāchi abali: Ọ kpukwara kpakpando nile, 17Chineke we tinye ha nime mbara elu-igwe inye ìhè n'elu uwa, 18na ichi ehihie na ichi abali, na ikpa ókè n'etiti ìhè na ọchichiri: Chineke we hu na ọ di nma. 19Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-anọ.
20Chineke we si, Ka miri nuputa ihe nēnuputa enuputa, bú anu nwere nkpuru-obi di ndu, ka anu-ufe feghari kwa n'elu uwa n'iru mbara elu-igwe. 21Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma. 22Chineke we gọzie ha, si, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa miri di n'oké osimiri nile, ka anu-ufe ba kwa uba n'uwa. 23Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-ise.
24Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a. 25Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma. 26Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa. 27Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha. 28Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa. 29Chineke we si, Le, enyewom unu ihe-ọkukú nile ọ bula nāmiputa nkpuru-ọghigha, nke di n'elu uwa nile, na osisi nile ọ bula, nke nkpuru osisi nāmiputa nkpuru-ọghigha di nime ya; unu ka ọ diri ibu ihe-oriri: 30o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M'nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a. 31Chineke we hu ihe nile ọ bula O mere, ma, le, ọ di nma nke-uku. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-isi.

Currently Selected:

JENESIS 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy